Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 42:6-17 Bible Nso (IGBOB)

6. Ma Josef, ya onwe-ya bu onye-isi ala ahu: ya onwe-ya bu onye nēre ọka nye ndi ala ahu nile: umu-nne Josef we bia, kpọ isi ala nye ya, kpuchie iru-ha n'ala.

7. Josef we hu umu-nne-ya, ọ mata ha, ma ọ mere onwe-ya dika onye ala ọzọ n'ebe ha nọ, ọ we kpayere ha uka ike, si ha, Òle ebe unu si bia? Ha si, Site n'ala Kenean izuru ihe-oriri.

8. Josef we mata umu-nne-ya, ma ha onwe-ha amataghi ya.

9. Josef we cheta nrọ abua ahu nke ọ rọrọ bayere ha, ọ si ha, Ndi-nledo ka unu bu; ihu ọb͕ub͕a-ọtọ ala ka unu biaworo.

10. Ha si ya, É-è, onye-nwem, kama ndi-orù-gi abiawo izuru ihe-oriri.

11. Ayi nile, umu otù nwoke ka ayi bu, ndi ziri ezi ka ayi bu, ndi-orù-gi abughi ndi-nledo.

12. Ọ si ha, É-è, kama ọ bu ọb͕ub͕a-ọtọ ala ka unu biaworo ihu.

13. Ha si, Ayi onwe-ayi ndi-orù-gi bu umu-nne iri na abua, umu nke otù nwoke n'ala Kenean; ma, le, nke-ntà di n'aka nna-ayi ta, ma otù nke fọduru anọghi ndu.

14. Josef we si ha, Nke ahu bu ihe m'gwara unu, si, Ndi-nledo ka unu bu:

15. nime nka ka agānwaputa unu: Fero di ndu! unu agaghi-esi n'ebe a pua ma-ọli, ma ọ buru na nwa-nne-unu nke-ntà abiaghi n'ebe a.

16. Ziganu otù nime unu, ya kute nwa-nne-unu; ma unu onwe-unu, ka eke unu ab͕u, ka ewe nwaputa okwu nile unu, ma ezi-okwu di nime unu: ma ọ buru na ọ dighi otú a, Fero di ndu! ndi-nledo ka unu bu n'ezie.

17. Ọ we chikọta ha tiye n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ ubọchi atọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 42