Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 42:22-31 Bible Nso (IGBOB)

22. Reuben we za ha, si, Agwaghi m unu okwu, si, Unu emehiela megide nwa ahu; ma unu anughi? ọzọ kwa, ọbara-ya, le, anājuta ya.

23. Ma ha onwe-ha amaghi na Josef nānu ihe ha nēkwu; n'ihi na onye-nsughari nọ n'etiti ha.

24. O we si n'ebe ha nọ chighari onwe-ya, kwa, ákwá; o we laghachikute ha, gwa ha okwu, si n'etiti kuru Simeon, ke ya ab͕u n'iru anya-ha.

25. Josef we nye iwu, ha we kpojue ihe nile ha n'ọka, o nye kwa iwu inyeghachi ego-ha, nke onye ọ bula n'akpa-ya, na inye ha ihe ha gēri n'uzọ: ewe mere ha otú a.

26. Ha were ọka-ha bo inyinya-ibu-ha, si n'ebe ahu la.

27. Otù nime ha we meghe akpa-ya inye inyinya-ibu-ya nri-anu-ulo n'ebe inọ ọnọdu-abali, ọ we hu ego-ya; ma, le, ego ahu di n'ọnu akpa-ya.

28. Ọ si umu-nne-ya, Enyeghachiwo egom; ọzọ kwa, le, ọ di n'akpam: obi-ha we fepu, ha we nāmarita jijiji n'etiti onwe-ha, si, Gini bu nka Chineke meworo ayi?

29. Ha we biakute Jekob nna-ha, rue ala Kenean, gosi ya ihe nile dakwasiri ha; si,

30. Nwoke ahu, bú onye-nwe ala ahu, kpayere ayi uka ike, tiye ayi n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ dika ndi-nledo ala.

31. Ayi we si ya, Ndi ziri ezi ka ayi bu, ayi abughi ndi-nledo:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 42