Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 42:20-26 Bible Nso (IGBOB)

20. ma nwa-nne-unu nke-ntà ka unu gēme ka ọ biakutem; agēgosi kwa na okwu nile unu bu ezi-okwu, unu agaghi-anwu kwa. Ha we me otú a.

21. Ha we sirita onwe-ha, N'ezie ndi ikpe maworo bayere nwa-nne-ayi ka ayi bu, n'ihi na ayi huru nkpab͕u nke nkpuru-obi-ya, mb͕e ọ nāriọ ayi aririọ-amara, ma ayi anughi; n'ihi ya ka nkpab͕u a biakwasiworo ayi.

22. Reuben we za ha, si, Agwaghi m unu okwu, si, Unu emehiela megide nwa ahu; ma unu anughi? ọzọ kwa, ọbara-ya, le, anājuta ya.

23. Ma ha onwe-ha amaghi na Josef nānu ihe ha nēkwu; n'ihi na onye-nsughari nọ n'etiti ha.

24. O we si n'ebe ha nọ chighari onwe-ya, kwa, ákwá; o we laghachikute ha, gwa ha okwu, si n'etiti kuru Simeon, ke ya ab͕u n'iru anya-ha.

25. Josef we nye iwu, ha we kpojue ihe nile ha n'ọka, o nye kwa iwu inyeghachi ego-ha, nke onye ọ bula n'akpa-ya, na inye ha ihe ha gēri n'uzọ: ewe mere ha otú a.

26. Ha were ọka-ha bo inyinya-ibu-ha, si n'ebe ahu la.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 42