Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 41:2-13 Bible Nso (IGBOB)

2. Ma, le, ehi asa nēsi n'osimiri Nail rigoputa, ha mara nma ile anya ma kwa abuba n'anu-aru-ha; ha we nāta nri n'etiti ubi.

3. Ma, le, ehi asa ọzọ nēsi n'osimiri Nail rigoputa n'azu ha, ha jọrọ njọ ile anya, ta kwa aru n'anu-aru-ha; ha we guzo nso ehi asa ọzọ ahu n'usọ osimiri Nail.

4. Ehi ahu ndi jọrọ njọ ile anya, ndi takwara aru n'anu-aru-ha, we rie ehi asa ahu mara nma ile anya ma kwa abuba. Fero we teta.

5. O we raru ura rọ nrọ nke ub͕ò abua: ma, le, oko ọka asa nāwaputa n'otù ókpòrò, ha buru ibu di kwa nma.

6. Ma, le, oko ọka asa, nke fikpọrọ afikpọ, nke ifufe Iru-anyanwu chakpọkwara achakpọ, nēpuso ha n'azu.

7. Oko ọka asa nke fikpọrọ afikpọ we loda oko ọka asa ahu nke buru ibu so kwa nkpuru. Fero we teta, ma, le, ọ bu nrọ.

8. O rue, n'ututu, na mọ-ya b͕asasiri; o we ziga kpọ ndi-ode-akwukwọ di nsọ nile nke Ijipt, na ndi-ya nile mara ihe: Fero we kọrọ ha nrọ-ya; ma ọ dighi onye nākọrọ Fero isi-ha.

9. Onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu we gwa Fero okwu, si, Nmehiem nile ka mu onwem nēhota ta:

10. Fero were iwe n'aru ndi-orù-ya, tinye m n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ n'ulo onye-isi ndi-ob͕ū, mu na onye-isi ndi osi ite:

11. ayi we rọ nrọ n'otù abali, mu na ya; onye ọ bula dika akukọ-isi nrọ-ya si di, otú a ka ayi rọrọ.

12. Ma ayi na otù okorọbia nọ n'ebe ahu, bú onye-Hibru, orù onye-isi nke ndi-ob͕ū nwere; ayi we kọrọ ya, ọ we kọrọ ayi isi nrọ-ayi; onye ọ bula n'etiti ayi dika nrọ-ya si di ka ọ kọrọ isi nrọ nye.

13. O rue na, dika ọ kọrọ isi nrọ nye ayi, otú a ka ọ di; mu ka ọ mere ka m'lata n'ọnọdum, ma ya ka ọ kwugburu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 41