1. O rue, n'ọgwugwu ogologo arọ abua, na Fero nārọ nrọ: ma, le, o nēguzo n'akuku osimiri Nail.
2. Ma, le, ehi asa nēsi n'osimiri Nail rigoputa, ha mara nma ile anya ma kwa abuba n'anu-aru-ha; ha we nāta nri n'etiti ubi.
3. Ma, le, ehi asa ọzọ nēsi n'osimiri Nail rigoputa n'azu ha, ha jọrọ njọ ile anya, ta kwa aru n'anu-aru-ha; ha we guzo nso ehi asa ọzọ ahu n'usọ osimiri Nail.
4. Ehi ahu ndi jọrọ njọ ile anya, ndi takwara aru n'anu-aru-ha, we rie ehi asa ahu mara nma ile anya ma kwa abuba. Fero we teta.
5. O we raru ura rọ nrọ nke ub͕ò abua: ma, le, oko ọka asa nāwaputa n'otù ókpòrò, ha buru ibu di kwa nma.
6. Ma, le, oko ọka asa, nke fikpọrọ afikpọ, nke ifufe Iru-anyanwu chakpọkwara achakpọ, nēpuso ha n'azu.
7. Oko ọka asa nke fikpọrọ afikpọ we loda oko ọka asa ahu nke buru ibu so kwa nkpuru. Fero we teta, ma, le, ọ bu nrọ.