Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 40:13-23 Bible Nso (IGBOB)

13. ọ fọduru ubọchi atọ Fero gēweli isi-gi, me ka i lata n'ọnọdu-gi: i gēnye kwa iko Fero n'aka-ya, dika i nēme na mbu mb͕e i buri obu-ihe-ọṅuṅu-ya.

14. Ma otú ọ di chetam n'onwe-gi mb͕e ọ gādiri gi nma, mekwara m ebere, biko, chetakwa m n'iru Fero, me ka m'si n'ulo a pua:

15. n'ihi na ezupurum n'ala ndi-Hibru n'ezie: ọzọ kwa, n'ebe a emeghm ihe ọ bula ka ha we tinye m n'olùlù a.

16. Onye-isi ndi-osi-ite we hu na akukọ-isi nrọ a di nma, ọ we si Josef, Mu onwem di kwa na nrọm, ma, le, nkata atọ nke achicha ọcha di n'isim:

17. ufọdu nime ihe-oriri nile nke Fero nke osi ite nēsi di kwa na nkata nke kachasi elu; anu-ufe nēri kwa ha site na nkata ahu n'elu isim.

18. Josef we za, si, Nka bu akukọ-isi-ya: nkata atọ ahu, ubọchi atọ ka ha bu;

19. ọ fọduru ubọchi atọ Fero gēweli isi-gi wepu ya n'aru gi, kwuba gi n'elu osisi; anu-ufe gēri kwa anu-aru-gi site n'aru gi.

20. O rue, n'ubọchi nke-atọ, nke bu ubọchi ncheta ọmumu Fero, na o mere oké oriri nye ndi-orù-ya nile: o welie isi onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu na isi onye-isi ndi-osi-ite n'etiti ndi-orù-ya.

21. O me ka onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu lata n'ọnọdu-obu-ihe-ọṅuṅu-ya; o we nye iko n'aka Fero:

22. ma ọ kwubara onye-isi ndi-osi-ite: dika Josef kọrọ isi nrọ nye ha.

23. Ma onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu echetaghi Josef, kama o chezọrọ ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 40