Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 4:6-17 Bible Nso (IGBOB)

6. Jehova we si Ken, N'ìhi gini ka i nēwe iwe di ọku? ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka iru-gi b͕aruru?

7. Ọ buru na i nēme nke-ọma, ọ̀ bughi nb͕asa-iru ka i gēnwe? ọ buru kwa na i meghi nke-ọma, n'ọnu-uzọ ka nmehie nāma-kpu dika anu-ọhia: ọ bu kwa n'ebe i nọ ka ọchichọ-ya di, ma ọ kwesiri ka gi onwe-gi chia ya.

8. Ken we si Ebel, bú nwa-nne-ya, Ka ayi je n'ọhia. O rue, mb͕e ha nọ n'ọhia, na Ken biliri imegide Ebel, bú nwa-nne-ya, we b͕ue ya.

9. Jehova we si Ken, Òle ebe Ebel, bú nwa-nne-gi, nọ? Ọ we si, Amaghm: ọ̀ bu onye-nche nwa-nnem ka m'bu?

10. Ọ si, Gini ka i meworo? ge nti! olu ọbara nwa-nne-gi nētikum site n'ala.

11. Ma ub͕u a, onye anābu ọnu ka i bu site n'ala, nke saghere ọnu-ya inara ọbara nwa-nne-gi n'aka-gi;

12. mb͕e i nālu ọlu ubi, ọ gaghi-enye gi ike-ya ọzọ; onye nāṅaghari na ọsọ ka i gābu n'uwa.

13. Ken we si Jehova, Ahuhu ajọ omumem di uku kari obubu.

14. Le, I chupuwom ta n'iru ala; ọ bu kwa n'iru-Gi ka agēzopum; m'gābu kwa onye nāṅaghari na ọsọ n'uwa; o gēru kwa na onye ọ bula nke nāhum gēb͕um.

15. Jehova we si ya, N'ihi nka onye ọ bula nke nēb͕u Ken, okpukpu asa ka agābọ ọ́bọ̀ n'aru ya. Jehova we doro Ken ihe-iriba-ama, ka onye ọ bula nke nāhu ya we ghara itib͕u ya.

16. Ken we si n'iru Jehova pua, biri n'ala Nod, n'Iru-anyanwu Iden.

17. Ken we mara aru nwunye-ya; ọ we turu ime, mua Inok: ma Ken nọ nēwu obodo, o we kpọ aha obodo ahu, dika aha nwa-ya nwoke si di, Inok.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 4