Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 4:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Madu ahu we mara aru Iv, bú nwunye-ya; o we turu ime, mua Ken, si, Enwetawom nwoke site n'iye-aka Jehova.

2. Ọzọ kwa, ọ mua nwa-nṅe-ya nwoke, bú Ebel. Ebel we buru onye nāzù ìgwè ewu na aturu, ma Ken bu onye nālu ọlu ubi.

3. O rue, n'ọgwugwu ubọchi ufọdu, na Ken wetara ufọdu nime nkpuru ala ibu onyinye-inata-iru-ọma enyere Jehova.

4. Ebel kwa, ya onwe-ya wetakwara ufọdu nime umu eburu uzọ mu nke ìgwè ewu na aturu ya, na ufọdu nime iberibe-ha mara abuba. Jehova we le Ebel, le kwa onyinye-inata-iru-ọma-ya, anya ọma:

5. ma Ken na onyinye-inata-iru-ọma-ya, O leghi ha anya ọma. Ken we we iwe di ọku nke-uku, iru-ya we b͕arua.

6. Jehova we si Ken, N'ìhi gini ka i nēwe iwe di ọku? ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka iru-gi b͕aruru?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 4