Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 38:22-28 Bible Nso (IGBOB)

22. Ọ we laghachikute Juda, si, Achọtaghm ya; ọzọ kwa, ndikom ebe ahu siri, Ọ dighi nwayi edoro nsọ ikwa iko nọworo n'ebe a.

23. Juda we si, Ka o were ya n'onwe-ya, ka ayi we ghara ighọ ihe ileda anya: le, ezigaram nwa-ewu a, ma gi onwe-gi achọtaghi ya.

24. O rue, mb͕e ihe ra ka ọnwa atọ gasiri, na egosiri Juda, si, Tema, bú nwunye nwa-gi, akwawo iko; ọzọ kwa, le, ọ di ime site n'ikwa-iko. Juda we si, Me ka ọ puta, ka esure ya ọku.

25. Mb͕e anēme ka nwayi ahu puta, ya onwe-ya zigara nna di-ya ozi, si, Site n'aka nwoke nke nwe ihe ndia ka mu onwem di ime: ọ si kwa, Biko, mata onye nwe ihe ndia, bú nb͕a-aka-akàrà, na eriri-nma, na nkpa-n'aka.

26. Juda we mata ha, ọ si, Ọ bu onye ezi omume kari mu onwem; n'ihi na eweghm ya nye Shila, bú nwam. Ma ọ maghi kwa ya ọzọ ma-ọli.

27. O rue na, nime mb͕e ọmumu-nwa-ya, le, umu abua di n'afọ-ya.

28. O rue, n'ọmumu-nwa-ya, na otù setipuru aka: nwayi nke nēle ime anya we were ogho uhie ke n aka-ya, si, Nka buru uzọ puta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 38