Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 38:10-25 Bible Nso (IGBOB)

10. Ma ihe ọ mere jọrọ njọ n'anya Jehova; O we me ka ọ nwu kwa.

11. Juda we si Tema, bú nwunye nwa-ya, Nọdu n'ọnọdu nwayi di-ya nwuru n'ulo nna-gi, rue mb͕e Shila, bú nwam, gētozù: n'ihi na ọ siri, Ka ya onwe-ya we ghara inwu kwa, dika umu-nne-ya. Tema we je nọdu n'ulo nna-ya.

12. Ubọchi gabigara we di ọtutu, nwa-nwayi Shua, bú nwunye Juda, we nwua; ewe kasie Juda obi, o we rigokuru ndi nākpacha aji ìgwè ewu na aturu-ya rue Timna, ya onwe-ya na Haira, bú enyì-ya, bú onye Adulam ahu.

13. Ewe gosi Tema, si, Le, nna di-gi nārigoru Timna ikpacha aji ìgwè ewu na aturu-ya.

14. O we chipu n'aru ya uwe ọnọdu nwayi di-ya nwuru nke ya, were ákwà-nkpudo-ya kpuchie onwe-ya, fuchi onwe-ya, nọdu n'onu-uzọ Enaim, nke di n'uzọ Timna; n'ihi na ọ huru na Shila etozuwori, ma eweghi ya onwe-ya nye ya na nwunye.

15. Juda we hu ya, che na ọ bu nwayi nākwa iko; n'ihi na o kpuchiri iru-ya.

16. O we si n'ije-ya wezuga onwe-ya jekuru ya n'uzọ, si, Biko, ngwa, ka m'bakuru gi: n'ihi na ọ maghi na nwunye nwa-ya ka ọ bu. Tema we si, Gini ka i gēnyem, ka i we bakurum?

17. Ọ si, Mu onwem gēzitere gi nwa-ewu sitere n'ìgwè ewu na aturu. Tema we si, Ì gēnyem ihe-ibe, rue mb͕e i gēzite ya?

18. Ọ si, Gini bu ihe-ibe nke m'gēnye gi? Tema we si, Nb͕a-aka-akàrà-gi na eriri mma gi, na nkpa-n'aka-gi nke di n'aka-gi. Ọ chiri ha nye ya, we bakuru ya, o we turu ime n'aka-ya.

19. Tema we bilie, la, chipu ákwà-nkpudo-ya n'aru ya, yiri uwe ọnọdu nwayi di-ya nwuru nke ya.

20. Juda we zìe nwa-ewu ahu n'aka enyì-ya, bú onye Adulam, inara ihe-ibe ahu n'aka nwayi ahu: ma ọ chọtaghi ya.

21. O we jua ndikom nke ebe-ya, si, Òle ebe nwayi ahu edoro nsọ ikwa iko nọ, bú nwayi ahu nke nọduru n'Enaim n'uzọ? Ha si, Ọ dighi nwayi edoro nsọ ikwa iko nọworo n'ebe a.

22. Ọ we laghachikute Juda, si, Achọtaghm ya; ọzọ kwa, ndikom ebe ahu siri, Ọ dighi nwayi edoro nsọ ikwa iko nọworo n'ebe a.

23. Juda we si, Ka o were ya n'onwe-ya, ka ayi we ghara ighọ ihe ileda anya: le, ezigaram nwa-ewu a, ma gi onwe-gi achọtaghi ya.

24. O rue, mb͕e ihe ra ka ọnwa atọ gasiri, na egosiri Juda, si, Tema, bú nwunye nwa-gi, akwawo iko; ọzọ kwa, le, ọ di ime site n'ikwa-iko. Juda we si, Me ka ọ puta, ka esure ya ọku.

25. Mb͕e anēme ka nwayi ahu puta, ya onwe-ya zigara nna di-ya ozi, si, Site n'aka nwoke nke nwe ihe ndia ka mu onwem di ime: ọ si kwa, Biko, mata onye nwe ihe ndia, bú nb͕a-aka-akàrà, na eriri-nma, na nkpa-n'aka.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 38