Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 38:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, na mb͕e ahu, na Juda siri n'ebe umu-nne-ya nọ rida, si n'ije-ya wezuga onwe-ya ba n'ulo otù nwoke, bú onye Adulam, onye aha-ya bu Haira.

2. Juda we hu n'ebe ahu nwa-nwayi nke otù nwoke, bú onye Kenean, nke aha-ya bu Shua; ọ we kuru ya, bakuru ya.

3. Ọ we turu ime, mua nwa-nwoke; Juda we kpọ aha-ya Ia.

4. Ọ we turu ime ọzọ, mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Onan.

5. Ọ we mu kwa nwa-nwoke ọzọ, kpọ aha-ya Shila: ma Juda nọ na Kezib mb͕e ọ muru ya.

6. Juda we lutara Ia ọkpara-ya nwunye, nke aha-ya bu Tema.

7. Ma Ia, bú ọkpara Juda, jorọ njọ n'anya Jehova, Jehova we me ka ọ nwua.

8. Juda we si Onan, Bakuru nwunye nwa-nne-gi, we luara ya ọlu nwa-nne di, me ka nkpuru tolitere nwa-nne-gi.

9. Ma Onan mara na ọ bughi ya gēnwe nkpuru ahu; o we rue, na mb͕e ọ bula ọ bakuru nwunye nwa-nne-ya, na ọ wusiri ya n'ala, ka ọ we ghara inye nwa-nne-ya nkpuru.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 38