Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 38:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, na mb͕e ahu, na Juda siri n'ebe umu-nne-ya nọ rida, si n'ije-ya wezuga onwe-ya ba n'ulo otù nwoke, bú onye Adulam, onye aha-ya bu Haira.

2. Juda we hu n'ebe ahu nwa-nwayi nke otù nwoke, bú onye Kenean, nke aha-ya bu Shua; ọ we kuru ya, bakuru ya.

3. Ọ we turu ime, mua nwa-nwoke; Juda we kpọ aha-ya Ia.

4. Ọ we turu ime ọzọ, mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Onan.

5. Ọ we mu kwa nwa-nwoke ọzọ, kpọ aha-ya Shila: ma Juda nọ na Kezib mb͕e ọ muru ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 38