Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 37:13-29 Bible Nso (IGBOB)

13. Israel we si Josef, Umu-nne-gi, hà adighi-azù ewu na aturu na Shekem? bia, m'gēzì kwa gi jekuru ha. Ọ si ya, Lekwam.

14. Ọ si ya, Biko, je le ma umu-nne-gi nọ n'udo, ma ìgwè ewu na aturu di kwa n'udo; weghachikwaram okwu. O si na ndagwurugwu Hebron ziga ya, o we biarue Shekem.

15. Otù nwoke we hu ya, ma, le, ọ nāwaghari n'ọhia: nwoke ahu we jua ya, si, Gini ka i nāchọ?

16. Ọ si Umu-nnem ka m'nāchọ: biko, gosim ebe ha nāzù ewu na aturu.

17. Nwoke ahu we si, Ha esiwo n'ebe a bulie ije: n'ihi na anurum ka ha nāsi, K'ayi je Dotan. Josef we so umu-nne-ya, chọta ha na Dotan.

18. Ha we hu ya n'ebe di anya, ma tutu ọ biakute ha nso, ha b͕agide ya ìzù ọjọ ime ka ọ nwua.

19. Ha we sìrita onwe-ha, Le, ọ̀kà-nrọ a nābia.

20. Ma ub͕u a, bianu, ka ayi b͕ue ya, tubà ya n'otù nime olùlù ndia, ayi gāsi kwa, Ajọ anu eriwo ya: ayi gāhu kwa ihe nrọ-ya nile gābu.

21. Reuben we nu ya, naputa ya n'aka-ha, si, Ka ayi ghara itib͕u ya.

22. Reuben we si ha, Unu awusila ọbara; tubànu ya n'olùlù a nke di n'ọzara, ma unu esetila aka imegide ya: ka o we naputa ya n'aka-ha, ime ka ọ laghachikuru nna-ya.

23. O rue, mb͕e Josef biakutere umu-nne-ya, na ha yipuru Josef uwe-ya, bú uwe-nwuda ahu nwere aka nke di n'aru ya;

24. ha kuru ya, tubà ya n'olùlù ahu: ma olùlù ahu tọb͕ọrọ n'efu, miri adighi nime ya.

25. Ha we nọdu iri nri: ha we welie anya-ha, hu, ma, le usu-ije ndi Ishmael si na Gilead nābia, camel-ha nēbu kwa uda na balm na myrrh, nēje iweda ya n'Ijipt.

26. Juda we si umu-nne-ya, Ùrù gini di ya mb͕e ayi gēb͕u nwa-nne-ayi, zo ọbara-ya?

27. Bianu, ka ayi re ya nye ndi Ishmael ndia, aka-ayi adi-kwa-la n'aru ya; n'ihi na nwa-nne-ayi, bú anu-aru-ayi, ka ọ bu. Umu-nne-ya we nu olu-ya.

28. Ndi Midian, bú ndi-ahia, we gabiga; ha we sere Josef, si n'olùlù dọlite ya, re Josef nye ndi Ishmael n'orú nkpuru-ego ọla-ọcha. Ha we kubata Josef n'Ijipt.

29. Reuben we biaghachi n'olùlù ahu; ma, le, Josef anọghi n'olùlù ahu; ọ we dọwa uwe-ya nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 37