Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 37:11-18 Bible Nso (IGBOB)

11. Umu-nne-ya we kwo ya ekworo; ma nna-ya debere okwu ahu.

12. Umu-nne ya we je izù ìgwè ewu na aturu nke nna-ha na Shekem.

13. Israel we si Josef, Umu-nne-gi, hà adighi-azù ewu na aturu na Shekem? bia, m'gēzì kwa gi jekuru ha. Ọ si ya, Lekwam.

14. Ọ si ya, Biko, je le ma umu-nne-gi nọ n'udo, ma ìgwè ewu na aturu di kwa n'udo; weghachikwaram okwu. O si na ndagwurugwu Hebron ziga ya, o we biarue Shekem.

15. Otù nwoke we hu ya, ma, le, ọ nāwaghari n'ọhia: nwoke ahu we jua ya, si, Gini ka i nāchọ?

16. Ọ si Umu-nnem ka m'nāchọ: biko, gosim ebe ha nāzù ewu na aturu.

17. Nwoke ahu we si, Ha esiwo n'ebe a bulie ije: n'ihi na anurum ka ha nāsi, K'ayi je Dotan. Josef we so umu-nne-ya, chọta ha na Dotan.

18. Ha we hu ya n'ebe di anya, ma tutu ọ biakute ha nso, ha b͕agide ya ìzù ọjọ ime ka ọ nwua.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 37