25. Ndia bu kwa umu-ndikom Ana; Dishon, na Ọhọlibama nwa-nwayi Ana.
26. Ndia bu kwa umu-ndikom Dishon; Hemdan, na Eshban, na Itran, na Keran.
27. Ndia bu umu-ndikom Iza; Bilhan, na Zaavan, na Akan.
28. Ndia bu umu-ndikom Dishan; Uz, na Aran.
29. Ndia bu ndi-isi ndi Hoa; Lotan onye-isi, Shobal onye-isi, Zibeon onye-isi, Ana onye-isi,
30. Dishon onye-isi, Iza onye-isi, Dishan onye-isi: ndia bu ndi-isi ndi Hoa, dika ndi-isi-ha si di n'ala Sia.
31. Ndia bu eze ndi bu eze n'ala Edom, tutu eze ọ bula bu eze umu Israel.
32. Bela nwa Beoa bu eze n'Edom; aha obodo-ya bu Dinhaba.
33. Bela we nwua, Jobab nwa Zera, nke sitere na Bozra, we buru eze n'ọnọdu ya.