Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 34:4-14 Bible Nso (IGBOB)

4. Shekem we gwa nna-ya Hemoa okwu, si, Lutaram nwata-nwayi a na nwunye.

5. Ma Jekob nuru na o merururi Daina nwa-ya nwayi; ma umu-ya ndikom nọyere anu-ulo-ya n'ọhia: Jekob we b͕a nkiti rue mb͕e ha biara.

6. Hemoa, bú nna Shekem, we pukuru Jekob ikpayere ya uka.

7. Umu-ndikom Jekob we si n'ọhia bata mb͕e ha nuru ya: ọ nēwuta ndikom ahu, ha nēwe iwe di ọku nke-uku, n'ihi na ọ bu ihe-nzuzu ka o mere n'Israel, n'idinayere nwa-nwayi Jekob; nke nēkwesighi ime otú a.

8. Hemoa we kpayere ha uka, si, Shekem, bú nwam, nkpuru-obi-ya nāhu nwa-unu nwayi n'anya si-ike: biko, werenu ya nye ya na nwunye.

9. Ka ayi na unu nālurita kwa nwunye; nyenu ayi umu-unu ndinyom, kurukwanu umu-ayi ndinyom n'onwe-unu.

10. Ayi na unu gēbi kwa: ala nka gādi n'iru unu; birinu nāzukwanu ahia nime ya, nwe-kwa-nu ihe-onwunwe nime ya.

11. Shekem we si nna Daina, ọ si kwa umu-nne-ya, Ka m'huta amara n'iru unu, ihe unu gāsikwam m'gēnye.

12. Me ka ọ ba uba nke-uku n'isim, bú ego-ilu-nwunye na onyinye, m'gēnye dika unu gāsim, ma nyenum nwa-ab͕ọghọ ahu na nwunye.

13. Umu-ndikom Jekob we were aghughọ za Shekem na Hemoa nna-ya, we kwue, n'ihi na ọ meruru Daina nwa-nne-ha,

14. ha we si ha, Ayi apughi ime ihe a, iwere nwa-nne-ayi nwayi nye nwoke nke anēbighi úgwù; n'ihi na ihe-ita-uta ka ọ buru ayi:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 34