Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 34:1-11 Bible Nso (IGBOB)

1. Daina, bú nwa-nwayi Lia, nke ọ muru nye Jekob, we pua ihu umu-ndinyom ala ahu.

2. Shekem, bú nwa-nwoke Hemoa onye-Haivait, onye-isi ala ahu, we hu ya; o kuru ya, dinayere ya, weda ya n'ala.

3. Nkpuru obi ya we rapara n'aru Daina nwa-nwayi Jekob, ọ hu nwa-ab͕oghọ ahu n'anya, gwa nwa-ab͕ọghb͕ọ ahu okwu nābà ya n'obi.

4. Shekem we gwa nna-ya Hemoa okwu, si, Lutaram nwata-nwayi a na nwunye.

5. Ma Jekob nuru na o merururi Daina nwa-ya nwayi; ma umu-ya ndikom nọyere anu-ulo-ya n'ọhia: Jekob we b͕a nkiti rue mb͕e ha biara.

6. Hemoa, bú nna Shekem, we pukuru Jekob ikpayere ya uka.

7. Umu-ndikom Jekob we si n'ọhia bata mb͕e ha nuru ya: ọ nēwuta ndikom ahu, ha nēwe iwe di ọku nke-uku, n'ihi na ọ bu ihe-nzuzu ka o mere n'Israel, n'idinayere nwa-nwayi Jekob; nke nēkwesighi ime otú a.

8. Hemoa we kpayere ha uka, si, Shekem, bú nwam, nkpuru-obi-ya nāhu nwa-unu nwayi n'anya si-ike: biko, werenu ya nye ya na nwunye.

9. Ka ayi na unu nālurita kwa nwunye; nyenu ayi umu-unu ndinyom, kurukwanu umu-ayi ndinyom n'onwe-unu.

10. Ayi na unu gēbi kwa: ala nka gādi n'iru unu; birinu nāzukwanu ahia nime ya, nwe-kwa-nu ihe-onwunwe nime ya.

11. Shekem we si nna Daina, ọ si kwa umu-nne-ya, Ka m'huta amara n'iru unu, ihe unu gāsikwam m'gēnye.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 34