Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 32:1-14 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma Jekob jere n'uzọ-ya, ndi-mọ-ozi nke Chineke we zute ya.

2. mb͕e ọ huru ha Jekob siri, Ọmuma-ulo-ikwū Chineke ka nka bu: ọ we kpọ aha ebe ahu Mahanaim.

3. Jekob we zie ndi-ozi n'iru ya jekuru Isọ nwa-nne-ya rue ala Sia, bú ọhia Edom.

4. Ọ nye ha iwu, si Otú a ka unu gāsi onye-nwem Isọ; Otú a ka orù-gi Jekob siri, N'ulo Leban ka m'nọworo dika ọbìa, nọgide rue ub͕u a:

5. enwekwara m ehi, na inyinya-ibu, na ìgwè ewu na aturu, na orù-ndikom, na ndinyom nēje ozi: m'we zìe igosi onye-nwem, ihuta amara n'iru gi.

6. Ndi-ozi ahu we laghachikute Jekob, si, Ayi biakutere nwa-nne-gi Isọ, ọzọ kwa, ọ nābia izute gi, ya na nnù ndikom.

7. Jekob we tua egwu nke-uku, obi lọbakwara ya miri: ọ we kera ndi ya na ha nọ, na ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, na kamel, n'-omuma-ulo-ikwū abua;

8. ọ si, Ọ buru na Isọ abiarue otù ọmuma-ulo-ikwū, tib͕ue ya, ọmuma-ulo-ikwū nke fọduru gābu ndi b͕apuru ab͕apu.

9. Jekob we si, Chineke nke nnam Abraham, na Chineke nke nnam Aisak, Jehova, Nke nāsim, Laghachi n'ala-gi, laghachikuru umu-nna-gi, M'gēme kwa gi nma:

10. ekwe-sighm ebere nile, na ezi-okwu nile, nke I meworo orù-Gi: n'ihi na nkpa-n'akam ka m'were gabiga Jọdan nka; ma ub͕u a aghọwom ọmuma-ulo-ikwū abua.

11. Biko, naputam n'aka nwa-nnem, n'aka Isọ: n'ihi na mu onwem nātu egwu ya, ma eleghi anya ọ gābia, tib͕ue m, tib͕ukwa nne tinyere umu-ya.

12. Ma Gi onwe-gi siri, Aghaghm ime gi nma, M'gēme kwa nkpuru-gi ka ọ di ka ájá nke oké osimiri, nke anāpughi iguta ọnu n'ihi ọtutu ọ di.

13. O we nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu abali ahu; o were kwa ufọdu nime ihe batara n'aka-ya ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma inye Isọ nwa-nne-ya;

14. ọgu nne-ewu iri na orú nkpi, ọgu nne-aturu iri na orú ebulu,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 32