Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 31:46-55 Bible Nso (IGBOB)

46. Jekob we si umu-nne-ya, Chikọtanu nkume; ha we were nkume me obo: ha we rie nri n'ebe ahu n'akuku obo ahu.

47. Leban we kpọ ya Jega-sahaduta: ma Jekob kpọrọ ya Galeed.

48. Leban we si, Obo a bu ihe-àmà n'etiti mu na gi ta. N'ihi nka akpọrọ aha-ya Galeed:

49. na Mizpa, n'ihi na ọ siri, Ka Jehova che nche n'etiti mu na gi, mb͕e agēzopu ayi, otù onye n'ebe ibe-ya nọ.

50. Ọ buru na i weda umum ndinyom n'ala, ọ buru kwa na i kuru ndinyom tiyere umum ndinyom, ọ dighi onye ayi na ya nọ; le Chineke bu onye-àmà n'etiti mu na gi.

51. Leban we si Jekob, Le obo a, le kwa ogidi a, nke m'tob͕ọworo n'etiti mu na gi.

52. Ihe-àmà ka obo a bu, ihe-àmà ka ogidi a bu kwa, na mu onwem agaghi-agabiga obo a jekuru gi ma-oli, na gi onwe-gi agaghi-agabiga kwa obo a na ogidi a biakutem ma-ọli, ime ihe ọjọ.

53. Chineke nke Abraham, na Chineke nke Nehoa, bú Chineke nke nna-ha, kpe ikpe n'etiti ayi. Jekob we were Oké Egwù nke nna-ya Aisak ṅua iyi.

54. Jekob we chua àjà n'ugwu ahu kpọ umu-nne-ya ka ha rie nri: ha we rie nri, nọ ọnọdu-abali n'ugwu ahu.

55. Leban we bilie n'isi-ututu, sutu umu-ya ndikom na umu-ya ndinyom ọnu nke-uku, gọzie ha: Leban we la, laghachi n'ebe nke ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 31