Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 31:39-51 Bible Nso (IGBOB)

39. Nke anu-ọhia dọb͕uru, ewetaghi m ya nye gi; mu onwem nēdochi ya; site n'akam ka i nāchọ ya, ma-ọbu ihe ezuru n'ehihie ma-ọbu ihe ezuru n'abali.

40. Otú a ka m'nọworo; n'ehihie ọkpukpọ-nku ririm, ọtutu-oyi rikwara m n'abali; uram we fepu n'anyam abua.

41. Orú arọ a ka m'nọworo n'ulo-gi; m'efère gi arọ iri na anọ n'ihi umu-gi ndinyom abua, na arọ isi n'ihi ìgwè ewu na aturu-gi: i b͕anwewo kwa ugwọ-ọlum ub͕ò iri.

42. Ọ buru na Chineke nke nnam, bú Chineke nke Abraham, na Oké Egwù nke Aisak, anọghi n'akukum, n'ezie ub͕u a n'aka efu ka i gēzilagawomri. Nweda-n'alam na ndọb͕u m'ji akam abua nādọb͕u onwem n'ọlu ka Chineke huworo, Ọ̀ we bara gi nba n'abali nyahuru.

43. Leban we za, si Jekob, Umu-ndinyom ndia bu umu-ndinyom nkem, umu-ndikom ndia bu kwa umu-ndikom nkem, ìgwè ewu na aturu ndia bu kwa ìgwè ewu na aturu nkem, ihe ọ bula kwa gi onwe-gi nāhu, nkem ka ọ bu: ma umum ndinyom, gini ka m'gēmere ndia ta, gini ka m'gēme-kwa-ra umu-ha ndikom ndi ha mutara?

44. Ma ub͕u a bia, ka ayi b͕a ndu, mu na gi; ọ gābu kwa ihe-àmà n'etiti mu na gi.

45. Jekob we were nkume, guzo ya ka ọ buru ogidi.

46. Jekob we si umu-nne-ya, Chikọtanu nkume; ha we were nkume me obo: ha we rie nri n'ebe ahu n'akuku obo ahu.

47. Leban we kpọ ya Jega-sahaduta: ma Jekob kpọrọ ya Galeed.

48. Leban we si, Obo a bu ihe-àmà n'etiti mu na gi ta. N'ihi nka akpọrọ aha-ya Galeed:

49. na Mizpa, n'ihi na ọ siri, Ka Jehova che nche n'etiti mu na gi, mb͕e agēzopu ayi, otù onye n'ebe ibe-ya nọ.

50. Ọ buru na i weda umum ndinyom n'ala, ọ buru kwa na i kuru ndinyom tiyere umum ndinyom, ọ dighi onye ayi na ya nọ; le Chineke bu onye-àmà n'etiti mu na gi.

51. Leban we si Jekob, Le obo a, le kwa ogidi a, nke m'tob͕ọworo n'etiti mu na gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 31