Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 31:3-15 Bible Nso (IGBOB)

3. Jehova we si Jekob, Laghachi n'ala nna-gi-hà, laghachikuru umu-nna-gi; M'gānọyekwara gi.

4. Jekob we zìe kpọ Rechel na Lia bia n'ọhia rue ebe ìgwè ewu na aturu-ya di,

5. ọ si ha, Mu onwem nāhu iru nna-unu, na ọ dighi n'ebe m'nọ dika ọ di na mb͕e gara aga; ma Chineke nke nnam anọyeworom.

6. Unu onwe-unu makwara na ewerewom ikem nile fè nna-unu.

7. Ma nna-unu akwawom emò, we b͕anwe ugwọ-olum ub͕ò iri; ma Chineke ekweghi ya mejọm.

8. Ọ buru na otú a ka ọ nāsi, Ndi turu agwa gābu ugwọ-ọlu-gi; ìgwè ewu na aturu nile we nāmu umu turu agwa: ma ọ buru na otú a ka ọ nāsi, Ndi dere ọcha gābu ugwọ-ọlu-gi; ìgwè ewu na aturu nile we nāmu umu dere ọcha.

9. Chineke we napu anu-ulo nna-unu, nyem.

10. O rue, na mb͕e ìgwè ewu na aturu turu ime, na ewelirim anyam abua, hu nime nrọ, ma, le, nkpi nile nke nāb͕a ìgwè ewu dere ọcha, tu kwa agwa, tu kwa akika.

11. Mọ-ozi nke Chineke we sim nime nrọ ahu, Jekob; m'we si, Lekwam.

12. Ọ si, Biko, welie anya-gi abua, hu, nkpi nile nke nāb͕a ìgwè ewu dere ọcha, tu kwa agwa, tu kwa akika: n'ihi na ahuwom ihe nile Leban nēme gi.

13. Mu onwem bu Chineke nke Betel, ebe i tere ogidi manu, ebe i kwerem nkwa: ub͕u a bilie, si n'ala nka pua, laghachi n'ala nke ọmumu-gi.

14. Rechel na Lia we za, si ya, Ọ̀ di òkè ma-ọbu ihe-nketa ayi nwere n'ulo nna-ayi ọzọ?

15. Ọ̀ bughi na ndi ala ọzọ ka ọ guworo ayi? n'ihi na ọ rewo ayi, ripiasia kwa ego-ayi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 31