Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 31:29-42 Bible Nso (IGBOB)

29. Ọ diri ike akam imejọ unu: ma Chineke nke nna-unu gwaram okwu n'abali nyahuru, si, Lezie onwe-gi anya ka i ghara ikpayere Jekob uka, ma-ọbu nke di nma ma-ọbu nke jọrọ njọ.

30. Ma ub͕u a, i lawo n'ezie, n'ihi na agu ulo nna-gi gusiri gi ike, ma n'ìhi gini ka i zuworo chim-hà?

31. Jekob we za, si Leban, N'ihi na aturum egwu: n'ihi na asirim, Ka i we ghara inapum umu-gi ndinyom n'ike.

32. Onye ọ bula i gāchọta chi-gi-hà n'aka-ya, ọ gaghi-adi ndu: n'iru umu-nne-ayi mata ihe nke gi di n'akam, were n'onwe-gi. N'ihi na Jekob amaghi na Rechel zuru ha-ri ori.

33. Leban we ba n'ulo-ikwū Jekob, na n'ulo-ikwū Lia, na n'ulo-ikwū orù-ndinyom abua; ma ọ chọtaghi ha. Ọ we si n'ulo-ikwū Lia pua, ba n'ulo-ikwū Rechel.

34. Ma Rechel wereri teraphim ahu, tinye ha nime ihe eji anọkwasi camel, we nọkwasi ha. Leban we bitu ulo-ikwū ahu nile aka, ma ọ chọtaghi ha.

35. Rechel we si nna-ya, Ya abula ihe iwe iwe di ọku n'anya onye-nwem na apughm ibili n'iru gi; n'ihi na ọ dim dika ọ nādi ndinyom. Ọ we chọsie ike, ma ọ chọtaghi teraphim ahu.

36. Jekob we we iwe di ọku, so Leban se okwu: Jekob we za, si Leban, Gini bu njehiem? gini bu nmehiem, na i chuworom n'ọku ọku?

37. Ọ bu ezie na i bituwo ihem nile aka, ma gini ka i chotaworo nime ihe nile nke ulo-gi? Tọb͕ọ ya ebe a n'iru umu-nnem na umu-nne-gi, ka ha we kpezie n'etiti ayi abua.

38. Orú arọ a ka mu onwem nọyeworo gi; nne-aturu-gi na nne-ewu-gi amukwoghi umu, erighkwa m ebulu nke ìgwè ewu na aturu-gi.

39. Nke anu-ọhia dọb͕uru, ewetaghi m ya nye gi; mu onwem nēdochi ya; site n'akam ka i nāchọ ya, ma-ọbu ihe ezuru n'ehihie ma-ọbu ihe ezuru n'abali.

40. Otú a ka m'nọworo; n'ehihie ọkpukpọ-nku ririm, ọtutu-oyi rikwara m n'abali; uram we fepu n'anyam abua.

41. Orú arọ a ka m'nọworo n'ulo-gi; m'efère gi arọ iri na anọ n'ihi umu-gi ndinyom abua, na arọ isi n'ihi ìgwè ewu na aturu-gi: i b͕anwewo kwa ugwọ-ọlum ub͕ò iri.

42. Ọ buru na Chineke nke nnam, bú Chineke nke Abraham, na Oké Egwù nke Aisak, anọghi n'akukum, n'ezie ub͕u a n'aka efu ka i gēzilagawomri. Nweda-n'alam na ndọb͕u m'ji akam abua nādọb͕u onwem n'ọlu ka Chineke huworo, Ọ̀ we bara gi nba n'abali nyahuru.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 31