Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 31:24-36 Bible Nso (IGBOB)

24. Chineke we biakute Leban onye Siria nime nrọ abali, si ya, Lezie onwe-gi anya ka i ghara ikpayere Jekob uka, ma-ọbu nke di nma ma-ọbu nke jọrọ njọ.

25. Leban we rue Jekob aru. Ma Jekob marari ulo-ikwū-ya n'ugwu ahu: Leban na umu-nne-ya makwara ulo-ikwū-ha n'ugwu Gilead.

26. Leban we si Jekob, Gini bu ihe i mere, na i ghọb͕uwom, dupu kwa umum ndinyom dika ndinyom eji mma-agha dọta n'agha?

27. N'ìhi gini ka i b͕ala-gara na nzuzo, we ghọb͕uem? ọ̀ bụ kwa n'ihi gini ka i nēgosighm, ka m'we were ọṅù, were kwa abù, were kwa egwú-otiti, were kwa ubọ-akwara, zilaga gi?

28. ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka inekweghim ka m'sutu umum ndikom na umum ndinyom ọnu? ub͕u a i mewo ihe-nzuzu.

29. Ọ diri ike akam imejọ unu: ma Chineke nke nna-unu gwaram okwu n'abali nyahuru, si, Lezie onwe-gi anya ka i ghara ikpayere Jekob uka, ma-ọbu nke di nma ma-ọbu nke jọrọ njọ.

30. Ma ub͕u a, i lawo n'ezie, n'ihi na agu ulo nna-gi gusiri gi ike, ma n'ìhi gini ka i zuworo chim-hà?

31. Jekob we za, si Leban, N'ihi na aturum egwu: n'ihi na asirim, Ka i we ghara inapum umu-gi ndinyom n'ike.

32. Onye ọ bula i gāchọta chi-gi-hà n'aka-ya, ọ gaghi-adi ndu: n'iru umu-nne-ayi mata ihe nke gi di n'akam, were n'onwe-gi. N'ihi na Jekob amaghi na Rechel zuru ha-ri ori.

33. Leban we ba n'ulo-ikwū Jekob, na n'ulo-ikwū Lia, na n'ulo-ikwū orù-ndinyom abua; ma ọ chọtaghi ha. Ọ we si n'ulo-ikwū Lia pua, ba n'ulo-ikwū Rechel.

34. Ma Rechel wereri teraphim ahu, tinye ha nime ihe eji anọkwasi camel, we nọkwasi ha. Leban we bitu ulo-ikwū ahu nile aka, ma ọ chọtaghi ha.

35. Rechel we si nna-ya, Ya abula ihe iwe iwe di ọku n'anya onye-nwem na apughm ibili n'iru gi; n'ihi na ọ dim dika ọ nādi ndinyom. Ọ we chọsie ike, ma ọ chọtaghi teraphim ahu.

36. Jekob we we iwe di ọku, so Leban se okwu: Jekob we za, si Leban, Gini bu njehiem? gini bu nmehiem, na i chuworom n'ọku ọku?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 31