15. Ọ̀ bughi na ndi ala ọzọ ka ọ guworo ayi? n'ihi na ọ rewo ayi, ripiasia kwa ego-ayi.
16. N'ihi na àkù nile nke Chineke napuworo nna-ayi, ọ bu ayi na umu-ayi nwe nke ahu: ub͕u a kwa, ihe ọ bula Chineke siri gi, me ya.
17. Jekob we bilie, palie umu-ya ndikom na ndinyom-ya dọkwasi ha n'elu camel-ya;
18. ọ we dupu anu-ulo-ya nile, na àkù-ya nile ọ kpatara, bú anu-ulo o nwetara, nke ọ kpatara na Padan-eram, ilakuru Aisak nna-ya rue ala Kenean.
19. Ma Leban jere ikpacha aji ìgwè ewu na aturu-ya: Rechel we zue teraphim nke nna-ya nwere n'ori.
20. Jekob we ghọb͕ue Leban onye Siria, n'ighara igosi ya na ya nāb͕alaga.