12. Ọ si, Biko, welie anya-gi abua, hu, nkpi nile nke nāb͕a ìgwè ewu dere ọcha, tu kwa agwa, tu kwa akika: n'ihi na ahuwom ihe nile Leban nēme gi.
13. Mu onwem bu Chineke nke Betel, ebe i tere ogidi manu, ebe i kwerem nkwa: ub͕u a bilie, si n'ala nka pua, laghachi n'ala nke ọmumu-gi.
14. Rechel na Lia we za, si ya, Ọ̀ di òkè ma-ọbu ihe-nketa ayi nwere n'ulo nna-ayi ọzọ?
15. Ọ̀ bughi na ndi ala ọzọ ka ọ guworo ayi? n'ihi na ọ rewo ayi, ripiasia kwa ego-ayi.
16. N'ihi na àkù nile nke Chineke napuworo nna-ayi, ọ bu ayi na umu-ayi nwe nke ahu: ub͕u a kwa, ihe ọ bula Chineke siri gi, me ya.
17. Jekob we bilie, palie umu-ya ndikom na ndinyom-ya dọkwasi ha n'elu camel-ya;
18. ọ we dupu anu-ulo-ya nile, na àkù-ya nile ọ kpatara, bú anu-ulo o nwetara, nke ọ kpatara na Padan-eram, ilakuru Aisak nna-ya rue ala Kenean.
19. Ma Leban jere ikpacha aji ìgwè ewu na aturu-ya: Rechel we zue teraphim nke nna-ya nwere n'ori.
20. Jekob we ghọb͕ue Leban onye Siria, n'ighara igosi ya na ya nāb͕alaga.
21. Ọ we b͕alaga, ya onwe-ya na ihe nile ọ nwere; ọ we bilie, gabiga Osimiri Yufretis, che iru-ya n'ugwu Gilead.
22. Ewe gosi Leban n'ubọchi nke-atọ na Jekob b͕alagarari.
23. Ọ we chiri umu-nne-ya tiyere onwe-ya, nāchu ya ije nke ubọchi asa, we chukuru ya n'ugwu Gilead.
24. Chineke we biakute Leban onye Siria nime nrọ abali, si ya, Lezie onwe-gi anya ka i ghara ikpayere Jekob uka, ma-ọbu nke di nma ma-ọbu nke jọrọ njọ.
25. Leban we rue Jekob aru. Ma Jekob marari ulo-ikwū-ya n'ugwu ahu: Leban na umu-nne-ya makwara ulo-ikwū-ha n'ugwu Gilead.
26. Leban we si Jekob, Gini bu ihe i mere, na i ghọb͕uwom, dupu kwa umum ndinyom dika ndinyom eji mma-agha dọta n'agha?
27. N'ìhi gini ka i b͕ala-gara na nzuzo, we ghọb͕uem? ọ̀ bụ kwa n'ihi gini ka i nēgosighm, ka m'we were ọṅù, were kwa abù, were kwa egwú-otiti, were kwa ubọ-akwara, zilaga gi?
28. ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka inekweghim ka m'sutu umum ndikom na umum ndinyom ọnu? ub͕u a i mewo ihe-nzuzu.