Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 30:8-13 Bible Nso (IGBOB)

8. Rechel we si, Nb͕a Chineke ka mu na nwa-nnem nwayi b͕aworo, enwewokwam ike: o we kpọ aha-ya Naftali.

9. Mb͕e Lia huru na ọ kwusiri imu nwa, ọ were Zilpa, bú nwayi nējere ya ozi, nye Jekob na nwunye.

10. Zilpa, bú nwayi nējere Lia ozi, we muara Jekob nwa-nwoke.

11. Lia we si, Enwerem isi-ọma! ọ we kpọ aha-ya Gad.

12. Zilpa, bú nwayi nējere Lia ozi, we muara Jekob nwa-nwoke nke-abua.

13. Lia we si, Na mb͕e ọ nāgaram nke-ọma! n'ihi na umu-ndinyom madu akpọwom onye ihe nāgara nke-ọma: ọ we kpọ aha-ya Asha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 30