Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 30:35-43 Bible Nso (IGBOB)

35. O we wezuga n'ubọchi ahu nkpi nile dere ọcha na nke turu ntupọ, na nne-ewu nile turu agwa na ntupọ, nke ọ bula nke nwere ọcha nime ya, na nke ọ bula di nji n'etiti aturu, o nye ha n'aka umu-ya ndikom;

36. o je ije nke ubọchi atọ n'etiti ya na Jekob: ma Jekob nāzù ìgwè ewu na aturu Leban fọduru.

37. Jekob we chiri n'onwe-ya nkpa-n'aka nke osisi poplar di ndu, na nke osisi almond, na nke osisi plane; o kpechaputa ebe di ọcha nime ha, nēme ka ọcha nke di nime nkpa-n'aka ahu puta ìhè.

38. O we guzo nkpa-n'aka ahu nke o kpere na ncherita-iru ìgwè ewu na aturu n'ebe anētiye miri n'ihe anu-ulo ji aṅu miri, ebe ìgwè ewu na aturu nābia iṅu miri; ha we turu ime mb͕e ha biara iṅu miri.

39. Ìgwè ewu na aturu ahu we turu ime n'iru nkpa-n'aka ahu, ìgwè ewu na aturu ahu we mua umu dere ọcha, na nke turu agwa, na nke turu ntupọ.

40. Jekob we wezuga umu-aturu, me ka ìgwè ewu na aturu che iru na nke dere ọcha na nke ọ bula di nji n'ìgwè ewu na aturu Leban; o we do ìgwè nke aka ya n'onwe-ha iche, ma o doghi ha n'ebe ìgwè ewu na aturu Leban di.

41. O rue, mb͕e ọ bula ndi di ike nime ìgwè ewu na aturu turu ime, na Jekob tọb͕ọrọ nkpa-n'aka ahu n'iru anya ìgwè ewu na aturu n'ebe anētiye miri, ka ha we turu ime n'etiti nkpa-n'aka ahu;

42. ma mb͕e ìgwè ewu na aturu nādighi ike, ọ dighi-atọb͕ọ ha: ndi nādighi ike we diri Leban, ma ndi di ike diri Jekob.

43. Nwoke ahu we basa nke-uku nke-uku, ọ we nwe ìgwè ewu na aturu ri nne, na ndinyom nēje ozi, na orù-ndikom, na camel na inyinya-ibu di ọtutu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 30