Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 30:3-7 Bible Nso (IGBOB)

3. Rechel we si, Le, orùm nwayi Bilha, bakuru ya, ka ọ we mua nwa n'ikperem abua, ewe site kwa na ya wuliem elu dika ulo, ọbuná mu onwem.

4. Ọ nye ya Bilha na nwunye, bú nwayi nējere ya ozi: Jekob we bakuru ya.

5. Bilha we turu ime, muara Jekob nwa-nwoke.

6. Rechel we si, Chineke ekpeputawom, ọzọ kwa, ọ nuwo olum, we nyem nwa-nwoke: n'ihi nka ka ọ kpọrọ aha-ya Dan.

7. Bilha, bú nwayi nējere Rechel ozi, we turu ime ọzọ, muara Jekob nwa-nwoke nke-abua.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 30