Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 30:3-17 Bible Nso (IGBOB)

3. Rechel we si, Le, orùm nwayi Bilha, bakuru ya, ka ọ we mua nwa n'ikperem abua, ewe site kwa na ya wuliem elu dika ulo, ọbuná mu onwem.

4. Ọ nye ya Bilha na nwunye, bú nwayi nējere ya ozi: Jekob we bakuru ya.

5. Bilha we turu ime, muara Jekob nwa-nwoke.

6. Rechel we si, Chineke ekpeputawom, ọzọ kwa, ọ nuwo olum, we nyem nwa-nwoke: n'ihi nka ka ọ kpọrọ aha-ya Dan.

7. Bilha, bú nwayi nējere Rechel ozi, we turu ime ọzọ, muara Jekob nwa-nwoke nke-abua.

8. Rechel we si, Nb͕a Chineke ka mu na nwa-nnem nwayi b͕aworo, enwewokwam ike: o we kpọ aha-ya Naftali.

9. Mb͕e Lia huru na ọ kwusiri imu nwa, ọ were Zilpa, bú nwayi nējere ya ozi, nye Jekob na nwunye.

10. Zilpa, bú nwayi nējere Lia ozi, we muara Jekob nwa-nwoke.

11. Lia we si, Enwerem isi-ọma! ọ we kpọ aha-ya Gad.

12. Zilpa, bú nwayi nējere Lia ozi, we muara Jekob nwa-nwoke nke-abua.

13. Lia we si, Na mb͕e ọ nāgaram nke-ọma! n'ihi na umu-ndinyom madu akpọwom onye ihe nāgara nke-ọma: ọ we kpọ aha-ya Asha.

14. Reuben we je na mb͕e obìbì ọka wheat, chọta mandrake n'ọhia, chita ha nye Lia nne-ya. Rechel we si Lia, Biko, nyem ufọdu nime mandrake nwa-gi.

15. Ọ we si ya, Ọ̀bu okwu ntà na i narawo dim? ì gānara kwa mandrake nwam? Rechel we si, N'ihi nka gi na ya gēdina n'abali a n'ihi mandrake nwa-gi.

16. Jekob we si n'ọhia bata n'anyasi, Lia we pua izute ya, si, Mu ka i gābakute; n'ihi na achiriwom mandrake nwam gota gi n'ezie. Ọ we dinayere ya n'abali ahu,

17. Chineke we ge Lia nti, ọ we turu ime, muara Jekob nwa-nwoke nke-ise.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 30