Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 30:26-38 Bible Nso (IGBOB)

26. Nyem ndinyom na umum ndi m'fèworo gi òfùfè n'ihi ha, ka m'la kwa: n'ihi na gi onwe-gi amawo òfùfèm nke m'fèworo gi.

27. Leban we si ya, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, gi nọgide: n'ihi na aribawom ama na Jehova agọziwom n'ihi gi.

28. Ọ si kwa, Kparam ókè ugwọ-ọlu-gi, m'gēnye kwa gi.

29. Ọ si ya, Gi onwe-gi amawo òfùfè m'fèworo gi, na ihe anu-ulo-gi ghọworo n'akam.

30. N'ihi na nwanti ka ihe i nwere bu tutu mu abia, ma ọ basawo rue ọtutu; Jehova agọziwo kwa gi n'ije-ukwum: ma ub͕u a òle mb͕e ka mu onwem gēme-kwa-ra ulom?

31. Ọ si, Gini ka m'gēnye gi? Jekob we si, I gaghi-enyem ihe ọ bula: ọ buru na i gēmerem ihe a, m'gāzù ìgwè ewu na aturu-gi ọzọ, debe kwa ya.

32. M'gāgabiga n'etiti ìgwè ewu na aturu-gi nile taa, si n'ebe ahu wezuga aturu ọ bula turu agwa na ntupọ, na aturu ọ bula di nji n'etiti aturu, na nke turu ntupọ na agwa n'etiti ewu: ọ gābu ugwọ-ọlum.

33. Ezi omumem gāza-kwa-ram n'ọdi-n'iru, mb͕e i gābia bayere ugwọ-ọlum nke di n'iru gi: nke ọ bula nke nātughi agwa na ntupọ n'etiti ewu, nkem nke nādighi kwa nji n'etiti aturu nkem, ihe ezuru ori ka nke ahu bu n'akam.

34. Leban we si, Le, biko, ya di ka okwu-gi si di.

35. O we wezuga n'ubọchi ahu nkpi nile dere ọcha na nke turu ntupọ, na nne-ewu nile turu agwa na ntupọ, nke ọ bula nke nwere ọcha nime ya, na nke ọ bula di nji n'etiti aturu, o nye ha n'aka umu-ya ndikom;

36. o je ije nke ubọchi atọ n'etiti ya na Jekob: ma Jekob nāzù ìgwè ewu na aturu Leban fọduru.

37. Jekob we chiri n'onwe-ya nkpa-n'aka nke osisi poplar di ndu, na nke osisi almond, na nke osisi plane; o kpechaputa ebe di ọcha nime ha, nēme ka ọcha nke di nime nkpa-n'aka ahu puta ìhè.

38. O we guzo nkpa-n'aka ahu nke o kpere na ncherita-iru ìgwè ewu na aturu n'ebe anētiye miri n'ihe anu-ulo ji aṅu miri, ebe ìgwè ewu na aturu nābia iṅu miri; ha we turu ime mb͕e ha biara iṅu miri.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 30