Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 30:25-32 Bible Nso (IGBOB)

25. O rue, mb͕e Rechel musiri Josef, Jekob siri Leban, Zilagam, ka m'we la n'ebem, na n'alam.

26. Nyem ndinyom na umum ndi m'fèworo gi òfùfè n'ihi ha, ka m'la kwa: n'ihi na gi onwe-gi amawo òfùfèm nke m'fèworo gi.

27. Leban we si ya, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, gi nọgide: n'ihi na aribawom ama na Jehova agọziwom n'ihi gi.

28. Ọ si kwa, Kparam ókè ugwọ-ọlu-gi, m'gēnye kwa gi.

29. Ọ si ya, Gi onwe-gi amawo òfùfè m'fèworo gi, na ihe anu-ulo-gi ghọworo n'akam.

30. N'ihi na nwanti ka ihe i nwere bu tutu mu abia, ma ọ basawo rue ọtutu; Jehova agọziwo kwa gi n'ije-ukwum: ma ub͕u a òle mb͕e ka mu onwem gēme-kwa-ra ulom?

31. Ọ si, Gini ka m'gēnye gi? Jekob we si, I gaghi-enyem ihe ọ bula: ọ buru na i gēmerem ihe a, m'gāzù ìgwè ewu na aturu-gi ọzọ, debe kwa ya.

32. M'gāgabiga n'etiti ìgwè ewu na aturu-gi nile taa, si n'ebe ahu wezuga aturu ọ bula turu agwa na ntupọ, na aturu ọ bula di nji n'etiti aturu, na nke turu ntupọ na agwa n'etiti ewu: ọ gābu ugwọ-ọlum.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 30