Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 30:11-26 Bible Nso (IGBOB)

11. Lia we si, Enwerem isi-ọma! ọ we kpọ aha-ya Gad.

12. Zilpa, bú nwayi nējere Lia ozi, we muara Jekob nwa-nwoke nke-abua.

13. Lia we si, Na mb͕e ọ nāgaram nke-ọma! n'ihi na umu-ndinyom madu akpọwom onye ihe nāgara nke-ọma: ọ we kpọ aha-ya Asha.

14. Reuben we je na mb͕e obìbì ọka wheat, chọta mandrake n'ọhia, chita ha nye Lia nne-ya. Rechel we si Lia, Biko, nyem ufọdu nime mandrake nwa-gi.

15. Ọ we si ya, Ọ̀bu okwu ntà na i narawo dim? ì gānara kwa mandrake nwam? Rechel we si, N'ihi nka gi na ya gēdina n'abali a n'ihi mandrake nwa-gi.

16. Jekob we si n'ọhia bata n'anyasi, Lia we pua izute ya, si, Mu ka i gābakute; n'ihi na achiriwom mandrake nwam gota gi n'ezie. Ọ we dinayere ya n'abali ahu,

17. Chineke we ge Lia nti, ọ we turu ime, muara Jekob nwa-nwoke nke-ise.

18. Lia we si, Chineke enyewom ugwo-ọlum, n'ihi na enyerem dim nwayi nējerem ozi' o we kpọ aha-ya Isaka.

19. Lia we turu ime ọzọ, muara Jekob nwa-nwoke nke-isi.

20. Lia we si, Chineke enyewom ezi onyinye; mb͕e a dim gēbiyerem, n'ihi na amuworom ya umu-ndikom isi: ọ we kpọ aha-ya Zebulun.

21. Emesia ọ mu-kwa-ra nwa-nwayi, kpọ aha-ya Daina.

22. Ma Chineke chetara Rechel, Chineke we ge ya nti, meghe àkpà-nwa-ya.

23. Ọ we turu ime, mua nwa-nwoke, si, Chineke ekpochapuwo ita-utam:

24. ọ we kpọ aha-ya Josef, si, Ka Jehova tukwasirim nwa-nwoke ọzọ.

25. O rue, mb͕e Rechel musiri Josef, Jekob siri Leban, Zilagam, ka m'we la n'ebem, na n'alam.

26. Nyem ndinyom na umum ndi m'fèworo gi òfùfè n'ihi ha, ka m'la kwa: n'ihi na gi onwe-gi amawo òfùfèm nke m'fèworo gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 30