Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 30:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma mb͕e Rechel huru na ọ mughi umu nye Jekob, Rechel we kwo nwa-nne-ya nwayi ekworo. ọ si Jekob, Nyem umu, ma ọ buru na inyeghm, onye nwuru anwu ka m'bu.

2. Iwe Jekob we di ọku megide Rechel: ọ si, Ọ̀ bu n'ọnọdu Chineke ka m'nọ, Onye b͕ochiworo gi nkpuru nke afọ?

3. Rechel we si, Le, orùm nwayi Bilha, bakuru ya, ka ọ we mua nwa n'ikperem abua, ewe site kwa na ya wuliem elu dika ulo, ọbuná mu onwem.

4. Ọ nye ya Bilha na nwunye, bú nwayi nējere ya ozi: Jekob we bakuru ya.

5. Bilha we turu ime, muara Jekob nwa-nwoke.

6. Rechel we si, Chineke ekpeputawom, ọzọ kwa, ọ nuwo olum, we nyem nwa-nwoke: n'ihi nka ka ọ kpọrọ aha-ya Dan.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 30