Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 28:4-12 Bible Nso (IGBOB)

4. Ya nye kwa gi ngọzi Abraham, gi, na nkpuru-gi tiyere gi; ka i we nweta ala nke ọnọdu-ọbìa-gi nile, nke Chineke nyere Abraham.

5. Aisak we zipu Jekob: ọ je Padan-eram, jekuru Leban, nwa Betuel onye Siria, bú nwa-nne-nwoke Rebeka, nne Jekob na Isọ.

6. Isọ we hu na Aisak gọziri Jekob, zipu kwa ya ije Padan-eram, isi n'ebe ahu lutara onwe-ya nwunye; ọ hu kwa na, mb͕e ọ nāgọzi ya, na ọ nyere ya iwu, si, Gi alula nwunye sitere n'umu-ndinyom Kenean;

7. ọ hu kwa na Jekob gere nna-ya, ge kwa nne-ya, nti, we je Padan-eram:

8. Isọ we hu na umu-ndinyom Kenean jọrọ njọ n'anya Aisak nna-ya;

9. Isọ we jekuru Ishmael lutara onwe-ya Mahalat na nwunye, bú nwa-nwayi Ishmael nwa Abraham, bú nwa-nne-nwayi Nebaiot, tiyere ndinyom ọ nwere.

10. Jekob we pua na Bia-sheba, nēje Heran.

11. Ọ biarue n'otù ebe, nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu, n'ihi na anya-nwu adawo; ọ were otù nime nkume nke ebe ahu, dọba n'okpuru isi-ya, we dina n'ebe ahu

12. Ọ rọ nrọ, ma, le, ubube nke eguzoro n'ala, ma elu-ya nēmetu ebe elu-igwe di: ma, le, ndi-mọ-ozi Chineke nārigo nārida na ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 28