Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 28:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Aisak we kpọ Jekob, gọzie ya, nye ya iwu, si ya, Gi alula nwunye sitete n'umu-ndinyom Keneam.

2. Bilie, je Padan-eram, rue ulo Betuel, bú nna nne-gi; si n'ebe ahu lutara onwe-gi nwunye sitere n'umu-ndinyom Leban, bú nwa-nne-nwoke nne-gi.

3. Ka Chineke Nke puru ime ihe nile gọzie gi, me ka i mua, ọmùmù, Ya me kwa ka i ba uba, ka i we ghọ nkpọkọta nke ndi di iche iche:

4. Ya nye kwa gi ngọzi Abraham, gi, na nkpuru-gi tiyere gi; ka i we nweta ala nke ọnọdu-ọbìa-gi nile, nke Chineke nyere Abraham.

5. Aisak we zipu Jekob: ọ je Padan-eram, jekuru Leban, nwa Betuel onye Siria, bú nwa-nne-nwoke Rebeka, nne Jekob na Isọ.

6. Isọ we hu na Aisak gọziri Jekob, zipu kwa ya ije Padan-eram, isi n'ebe ahu lutara onwe-ya nwunye; ọ hu kwa na, mb͕e ọ nāgọzi ya, na ọ nyere ya iwu, si, Gi alula nwunye sitere n'umu-ndinyom Kenean;

7. ọ hu kwa na Jekob gere nna-ya, ge kwa nne-ya, nti, we je Padan-eram:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 28