Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 27:7-18 Bible Nso (IGBOB)

7. Wetaram anu-nchuta, sierem nri utọ, ka n'we rie, gọzi kwa gi n'iru Jehova tutu ọnwum.

8. Ma ub͕u a, nwam, ge nti n'olum, dika ihe nke mu onwem nēnye gi n'iwu si di.

9. Biko, je ebe ìgwè ewu na aturu di, si n'ebe ahu chitaram umu-ewu abua di nma; m'gēwere kwa ha siere nna-gi nri utọ, dika nke ọ huru n'anya:

10. i gēbuga-kwa-ra nna-gi, ka ọ we rie, ka ọ we gọzie gi tutu ọnwu-ya.

11. Jekob we si Rebeka nne-ya, Le, Isọ nwannem bu nwoke b͕ara aji, ma mu onwem bu nwoke nāb͕aghi aji.

12. Eleghi anya nnam gēbitum aka, m'agādi kwa ka onye nākwa emò n'anya-ya; m'gēme kwa ka nkọcha biakwasim, ọ bughi kwa ngọzi.

13. Nne-ya we si ya, Ya dikwasim, bú nkọcha-gi, nwam: nání ge nti n'olum, je chitaram ha.

14. Ọ je, chita, butere nne-ya: nne-ya we sie nri utọ, dika nke nna-ya huru n'anya.

15. Rebeka we chiri uwe di oké ọnu-ahia nke Isọ, bú nwa-ya nke-okenye nke di n'aka-ya n'ulo, ọ we yibe Jekob, bú nwa-ya nke-ntà:

16. ọ chiri kwa akpukpọ umu-ewu ahu yibe ya n'aka-ya abua na n'olu-ya ebe aji nādigh:

17. o nye Jekob, bú nwa-ya, nri utọ na achicha n'aka, bú nke o doziri.

18. O we biakute nna-ya, si Nna m: ọ si, Lekwam; ònye ka i bu, nwam?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 27