44. gi na ya nọ ubọchi ole-na-ole, rue mb͕e ọnuma nwa-nne-gi gālaghachi;
45. rue mb͕e iwe nwa-nne-gi gēsi n'aru gi laghachi, ọ we chezọ ihe i meworo ya: m'gēziga kwa, si n'ebe ahu kulata gi: n'ìhi gini ka m'gēji kwa b͕ara aka unu abua, bú umum, n'otù ubọchi?
46. Rebeka we si Aisak, Ike ndum agwusiwom site n'iru umu-ndinyom Het: ọ buru na Jekob luru nwunye sitere n'umu-ndinyom Het, dika ndia, bú site n'umu-ndinyom ala nka, ùrù gini ka ndu baram?