Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 25:5-22 Bible Nso (IGBOB)

5. Abraham we nye Aisak ihe nile o nwere.

6. Ma umu-ndikom nke iko-ndinyom nke Abraham nwere, Abraham nyere ha onyinye di iche iche; o we si n'ebe Aisak nwa-ya nọ zilaga ha n'Iru-anyanwu, rue ala Iru-anyanwu, mb͕e ọ nọ ndu.

7. Ma ndia bu ubọchi arọ nile nke ndu Abraham nke ọ diri, ọgu arọ asatọ na arọ iri na ise.

8. Abraham we kubie ume, nwua n'ezi isi-awọ, buru agadi, ndu-ya jukwara ya afọ; ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ.

9. Aisak na Ishmael, bú umu-ya, we lìe ya n'ọb͕à Makpila, n'ọhia Efron nwa Zoha onye Het, nke di n'iru Mamre;

10. bú ọhia nke Abraham zutara n'aka umu Het: n'ebe ahu ka elìri Abraham na Sera, bú nwunye-ya.

11. O rue, mb͕e ọnwu Abraham gasiri, na Chineke gọziri Aisak nwa-ya; Aisak we biri n'akuku Bia-lahai-roi.

12. Ndia bu osuso-ọmumu Ishmael, nwa Abraham, onye Hega, bú nwayi Ijipt, bú nwayi nējere Sera ozi, muru nye Abraham:

13. ndia bu kwa aha umu-ndikom Ishmael, n'aha-ha, dika osuso-ọmumu-ha si di: ọkpara Ishmael, Nebaiot; na Kida, na Adbeel, na Mibsam,

14. na Mishma, na Duma, na Masa;

15. na Hedad, na Tima, na Jetua, na Nafish, na Kidema:

16. ndia bu umu-ndikom Ishmael, ndia bu kwa aha-ha, n'obodo ntà nile ha, na n'ebe-ulo-ikwū nile ha; ndi-isi iri na abua dika mba nile ha si di.

17. Ma ndia bu arọ nke ndu Ishmael, ọgu arọ isi na iri na asa: ọ we kubie ume, nwua; ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ.

18. Ha we biri site na Havila rue Shua nke di n'iru Ijipt, mb͕e i nēje Asiria: n'iru umu-nne-ya nile ka ọ dara ada.

19. Ndia bu osuso-ọmumu Aisak nwa Abraham: Abraham muru Aisak:

20. Aisak b͕ara ọgu arọ abua mb͕e ọ lutara Rebeka na nwunye, bú nwa-nwayi Betuel onye Siria nke Padan-eram, nwa-nne-nwayi Leban onye Siria.

21. Aisak we riọ Jehova aririọ n'ihi nwunye-ya, n'ihi na nwayi-àgà ka ọ bu: Jehova we kwe ka ọ riọta ihe ọ riọrọ, Rebeka, bú nwunye-ya, we turu ime.

22. Umu-ya we b͕a nb͕a nime afọ ya; ọ si, Ọ buru na ọ di otú a, n'ìhi gini kwa ka mu onwem di ndu? Ọ we je iju Jehova ase.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 25