Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 25:22-29 Bible Nso (IGBOB)

22. Umu-ya we b͕a nb͕a nime afọ ya; ọ si, Ọ buru na ọ di otú a, n'ìhi gini kwa ka mu onwem di ndu? Ọ we je iju Jehova ase.

23. Jehova we si ya,Mba abua di n'afọ-gi,Agēkewa kwa mba abua site n'úkwù-gi;Otù mba gēnwe ume kari mba ibe-ya;Nke-okenye gēfè nke-ntà.

24. Ubọchi-ya we zue imu nwa, ma, le, umu abua di n'afọ-ya.

25. Nke-mbu we puta nācha ọbara ọbara, aru-ya nile di ka uwe aji; ha we kpọ aha-ya Isọ.

26. Emesia nwa-nne-ya nwoke puta-kwa-ra, aka-ya nējide ikiri-ukwu Isọ; ewe kpọ aha-ya Jekob: Aisak b͕ara ọgu arọ atọ mb͕e Rebeka muru ha.

27. Umu-okoro ahu we tó etó: Isọ we buru nwoke mara ichu ntá, onye ọhia; ma Jekob bu nwoke zuru okè, nēbi n'ulo-ikwū.

28. Aisak we hu Isọ n'anya, n'ihi na ihe achutara na ntá nātọ ya utọ n'ọnu: ma Rebeka huru Jekob n'anya.

29. Jekob we sie ofé: Isọ we si n'ọhia bata, ya onwe-ya nāda kwa #mbà:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 25