Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 25:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Abraham we luru nwunye ọzọ, nke aha-ya bu Ketura.

2. Ọ muara ya Zimram, na Jọkshan, na Medan, na Midian, na Ishbak, na Shua.

3. Jọkshan muru Sheba, na Dedan. Umu Dedan we buru Ashurim, na Letushim, na Leumim.

4. Umundikom Midian: Ifa na Ifēa, na Hanok, na Abida, na Eldea. Ndia nile bu umu Ketura.

5. Abraham we nye Aisak ihe nile o nwere.

6. Ma umu-ndikom nke iko-ndinyom nke Abraham nwere, Abraham nyere ha onyinye di iche iche; o we si n'ebe Aisak nwa-ya nọ zilaga ha n'Iru-anyanwu, rue ala Iru-anyanwu, mb͕e ọ nọ ndu.

7. Ma ndia bu ubọchi arọ nile nke ndu Abraham nke ọ diri, ọgu arọ asatọ na arọ iri na ise.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 25