Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 24:55-66 Bible Nso (IGBOB)

55. Ma nwa-nne-ya nwoke na nne-ya siri, Ka nwa-ab͕ọgho nọyere ayi ubọchi asa ma-ọbu iri; emesia ọ gēje.

56. Ọ si ha, Unu eb͕ochilam, ebe Jehova meworo ka uzọm ga nke-ọma; zilagam ka m'lakuru onye-nwem.

57. Ha si, Ayi gākpọ nwa-ab͕ọghọ ahu, juta ya n'ọnu-ya.

58. Ha we kpọ Rebeka, si ya, Ì gēso nwoke a je? Ọ si, M'gēje.

59. Ha we zilaga Rebeka, bú nwa-nne-ha, na nwayi nyere ya ara na nwata, na orù Abraham, na ndikom-ya.

60. Ha we gọzie Rebeka, si ya, Nwa-nne-ayi, gi onwe-gi ghọ nnù kwuru nnù madu, ọzọ, ka nkpuru-gi nweta ọnu-uzọ-ama nke ndi nākpọ ha asì.

61. Rebeka we bilie, ya na umu-ab͕ọghọ-ya, ha we nọkwasi n'elu camel-ha, so nwoke ahu je: orù ahu we kuru Rebeka, la.

62. Ma Aisak biarari site n'ije Bia-lahai-roi; n'ihi na ya onwe-ya bi n'ala Negeb.

63. Aisak we pua itughari uche-ya n'ọhia na mb͕e anyasi: ọ welie anya-ya abua, hu, ma, le, camel ufọdu nābia.

64. Rebeka we welie anya-ya abua, hu Aisak, si n'elu camel-ya rida.

65. Ọ si orù ahu, Ònye bu nwoke ahu nke nēje ije n'ọhia izute ayi? Orù ahu we si, Onye ahu bu onye-nwem: Rebeka we were ákwà-nkpudo-ya kpuchie onwe-ya.

66. Orù ahu we kọrọ Aisak akukọ bayere ihe nile o mere.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 24