Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 24:46-52 Bible Nso (IGBOB)

46. Ọ me ngwa, si n'ubu-ya zie ite-ya, si, Ṅua, ọzọ kwa, camel-i ka m'gēme ka ha ṅua: m'we ṅua, camel ka ọ me-kwa-ra ka ha ṅua.

47. M'we jua ya, si, Nwa ònye ka i bu? Ọ si, Nwa Betuel ka m'bu, bú nwa Nehoa, onye Milka muru nye ya: m'we tiye nb͕a-aka ahu n'imi-ya, na ọla-aka abua ahu n'aka-ya abua.

48. M'we rube isi, kpọ isi ala nye Jehova, gọzie Jehova, bú Chineke nke onye-nwem Abraham, Onye durumri n'uzọ ezi-okwu ilutara nwa onye-nwem nwa nwa-nne-ya nwoke na nwunye.

49. Ma ub͕u a, ọ buru na unu gaje ime ebere na ezi-okwu n'ebe onye-nwem nọ, gosinum: ma ọ buru na unu agaghi-eme ya, gosinum; ka m'we che iru n'aka-nri, ma-ọbu n'aka-ekpe.

50. Leban na Betuel we za, si, N'aka Jehova ka okwu a siteworo: ayi apughi igwa gi ihe ọjọ ma-ọbu ezi ihe.

51. Le, Rebeka nọ n'iru gi, kuru ya, la, ka ọ ghọrọ nwa onye-nwe-gi nwunye, dika Jehova kwuworo.

52. O rue, mb͕e orù Abraham nuru okwu nile ha, na ọ kpọrọ isi ala nye Jehova.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 24