Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 24:39-51 Bible Nso (IGBOB)

39. M'we si onye-nwem, Eleghi anya nwayi ahu agaghi-esom je.

40. Ọ sim, Jehova, Onye m'jeghariworo n'iru Ya, gēziga mọ-ozi-Ya ka gi na ya yikọ je, Ọ gēme kwa ka ije-gi ga nke-ọma; i gāluta-kwa-ra nwam nwunye sitere n'ab͕urum, na n'ulo nnam:

41. mb͕e ahu i gāpu n'iyi i ṅurum, mb͕e i gābiakute ab͕urum; ọ buru kwa na ha enyeghi gi ya, i gāpu kwa n'iyi i ṅurum.

42. M'we bia ta rue isi-iyi ahu, si, Jehova, bú Chineke nke onye-nwem Abraham, biko, ọ buru na I nēme ijem nke mu onwem nēje ka ọ ga nke-ọma:

43. le, mu onwem nēguzo n'akuku isi-iyi miri a; ka o ru kwa, na nwa-ab͕ọgho ahu nke nāputa isere miri, onye m'gāsi ya, Biko, nyem nwantī miri site n'ite-gi ka m'ṅua;

44. onye gāsikwam, Gi onwe-gi ṅua, ọzọ kwa, camel-i ka m'gēsere miri nye: ka onye ahu buru nwayi Jehova rọputaworo nye nwa nke onye-nwem.

45. Ma tutu mu onwem agwasia obim okwu, le, Rebeka nāputa, ite-ya di kwa n'ubu-ya; ọ rida n'isi-iyi ahu, sere miri; m'we si ya, Biko, kwe ka m'ṅua.

46. Ọ me ngwa, si n'ubu-ya zie ite-ya, si, Ṅua, ọzọ kwa, camel-i ka m'gēme ka ha ṅua: m'we ṅua, camel ka ọ me-kwa-ra ka ha ṅua.

47. M'we jua ya, si, Nwa ònye ka i bu? Ọ si, Nwa Betuel ka m'bu, bú nwa Nehoa, onye Milka muru nye ya: m'we tiye nb͕a-aka ahu n'imi-ya, na ọla-aka abua ahu n'aka-ya abua.

48. M'we rube isi, kpọ isi ala nye Jehova, gọzie Jehova, bú Chineke nke onye-nwem Abraham, Onye durumri n'uzọ ezi-okwu ilutara nwa onye-nwem nwa nwa-nne-ya nwoke na nwunye.

49. Ma ub͕u a, ọ buru na unu gaje ime ebere na ezi-okwu n'ebe onye-nwem nọ, gosinum: ma ọ buru na unu agaghi-eme ya, gosinum; ka m'we che iru n'aka-nri, ma-ọbu n'aka-ekpe.

50. Leban na Betuel we za, si, N'aka Jehova ka okwu a siteworo: ayi apughi igwa gi ihe ọjọ ma-ọbu ezi ihe.

51. Le, Rebeka nọ n'iru gi, kuru ya, la, ka ọ ghọrọ nwa onye-nwe-gi nwunye, dika Jehova kwuworo.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 24