Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 24:16-28 Bible Nso (IGBOB)

16. Nwa-ab͕ọghọ ahu di nma nke-uku ile anya, nwayi nke akāmaghi nwoke, nwoke amaghi kwa aru-ya: ọ rida n'isi-iyi ahu, b͕ajue ite-ya, rigota.

17. Orù ahu we b͕a ọsọ izute ya, si, Biko, kwe ka m'ṅua nwantī miri site n'ite-gi.

18. Ọ si, Nua, onye-nwem: ọ me ngwa, zie ite-ya n'aka-ya, me ka ọ ṅua.

19. Mb͕e ọ mesiri ka ọ ṅua, nwayi ahu siri, Kamel gi ka m'gēsere kwa miri, rue mb͕e ha gāṅujuwori.

20. Ọ me ngwa, b͕apu miri di n'ite-ya nime ihe anu-ulo ji aṅu miri, ọ b͕a ọsọ ọzọ rue olùlù-miri isere miri, we sere nye camel-ya nile.

21. Nwoke ahu nēlegide ya anya, nāb͕a nkiti, imara ma Jehova mereri ka ije-ya ga nke-ọma, ma-ọbu na O meghi.

22. O rue, mb͕e camel ṅujusiri miri, na nwoke ahu were nb͕a-aka ọla-edo, nke ọtùtù-ya bu nkera shekel, na ọla-aka abua ib͕a n'aka-ya abua nke ọtùtù-ha bu shekel ọla-edo iri;

23. ọ si, Ǹwa onye ka i bu? biko, gosim. Ọ̀ di ọnọdu n'ulo nna-gi ayi gēnwe inọ ọnọdu-abali?

24. Nwayi ahu we si ya, Nwa Betuel ka m'bu, bú nwa Milka, nke ọ muru nye Nehoa.

25. Ọ sikwara ya, Ma okporo-ọka ma nri-anu-ulo riri nne n'ulo-ayi, ebe inọ ọnọdu-abali di kwa.

26. Nwoke ahu we rube isi, kpọ isi ala nye Jehova,

27. si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke onye-nwem Abraham, bu, Onye nārapughi ebere-Ya na ezi-okwu-Ya n'ebe onye-nwem nọ: mu onwem, n'uzọ ka Jehova duworom rue ulo umu-nne onye-nwem.

28. Nwa-ab͕ọghọ ahu we b͕a ọsọ, gosi ulo nne-ya dika okwu ndia si di.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 24