Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 2:8-17 Bible Nso (IGBOB)

8. Jehova, bú Chineke, we kua ubi nke ab͕ara ogige n'Iden, n'Iru-anyanwu; O we tinye madu ahu n'ebe ahu, bú onye Ọ kpururi.

9. Jehova, bú Chineke, we me ka osisi nile ọ bula si n'ala pue, bú nke anāchọsi ike n'ile anya, nke di kwa nma ihe-oriri; osisi nke ndu dikwa n'etiti ubi ahu ab͕ara ogige, na osisi nke ima ezi ihe na ihe ọjọ.

10. Osimiri nēsi kwa n'Iden puta idè ubi ahu ab͕ara ogige miri; ewe site n'ebe ahu kewa ya, ọ we ghọ isi miri anọ.

11. Aha osimiri nke-mbu bu Paishon: nke ahu bu nke nāga ala Havila nile gburugburu, ebe ọla-edo di;

12. ọla-edo ala ahu di nma: n'ebe ahu ka bdellium na nkume onyx di.

13. Aha osimiri nke-abua bu Gaihon: nke ahu bu nke nāga ala Etiopia nile buruburu.

14. Aha osimiri nke-atọ bu Hidekel: nke ahu bu nke nāga Asiria n'Iru-anyanwu. Osimiri nke-anọ bu Yufretis.

15. Jehova, bú Chineke, we were madu ahu me ka ọ nọdu n'ubi Iden ab͕ara ogige ilu ọlu-ya na idebe ya.

16. Jehova, bú Chineke, we nye madu ahu iwu, si, Nkpuru nke sitere n'osisi nile ọ bula nke ubi a ab͕ara ogige ka i ganēri eri:

17. ma nkpuru nke sitere n'osisi ima ezi ihe na ihe ọjọ, gi erila nkpuru sitere na ya: n'ihi na n'ubọchi i gēri nkpuru sitere na ya i ghaghi inwu anwu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 2