Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 19:23-30 Bible Nso (IGBOB)

23. Anyanwu awawo n'elu uwa mb͕e Lot batara nime Zoa.

24. Jehova we me ka brimstone na ọku si n'elu-igwe zokwasi Sọdọm na Gọmọra dika miri site n'ebe Jehova nọ;

25. O we kwatue obodo ndia, na Buruburu-ala ahu nile, na ndi nile bi n'obodo ahu nile, na ihe-opupú nke ala.

26. Ma nwunye-ya siri n'azu Lot leghachi anya n'azu, we ghọ ogidi nnú.

27. Abraham we bilie n'isi-ututu je ebe ahu nke o guzorori n'iru Jehova:

28. ọ le anya n'ebe Sọdọm na Gọmọra di, na n'ebe ala nile nke Buruburu-ala ahu di, ọ we hu, ma, le, anwuru-ọku nke ala ahu rigoro dika anwuru-ọku nke oké ọku.

29. O rue, mb͕e Chineke bibiri obodo nile nke Buruburu-ala ahu, na Chineke chetara Abraham, we si n'etiti nkwatu ahu zipu Lot, mb͕e Ọ kwaturu obodo nke Lot biri nime ha.

30. Lot we si na Zoa rigo, biri n'ugwu ahu, ya na umu-ya ndinyom abua; n'ihi na ọ turu egwu ibi nime Zoa: ọ we biri n'ọb͕à, ya onwe-ya na umu-ya ndinyom abua.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 19