Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 19:16-31 Bible Nso (IGBOB)

16. Ma ọ b͕agwojuru ya anya; ndikom ahu we jide aka-ya, jide kwa aka nwunye-ya, jide kwa aka umu-ya ndinyom abua; n'ihi na Jehova nwere ọmiko n'aru ya: ha we me ka ọ puta, me ka ọ nọdu n'azu obodo.

17. O rue, mb͕e ha mesiri ka ha puta n'azu obodo, na ọ siri, Wepuga onwe-gi n'ihi ndu-gi; elekwala anya n'azu gi, eguzokwala na Gburugburu-ala a nile; wepuga onwe-gi je ugwu ahu, ka ewe ghara ikpochapu gi.

18. Lot we si ha, É-è, biko, onye-nwem:

19. biko, le, orù-gi ahutawo amara n'iru gi, i mewo kwa ka ebere-gi di uku, nke i meworom n'idebem ndu; mu onwem apughi kwa iwepuga onwem je ugwu, ka ihe ọjọ ahu we ghara irapara n'arum, m'we nwua:

20. biko, le, obodo a di nso ib͕alaga n'ebe ahu, nke ahu bu kwa obodo ntà: biko, ka m'wepuga onwem je ebe ahu, (ọ̀ bughi obodo ntà?) nkpuru-obim gādi kwa ndu.

21. Ọ si ya, Le, m'huwo kwa gi iru-ọma n'okwu a, na m'gaghi-akwatu obodo a nke i kwuworo okwu bayere ya.

22. Me ngwa, wepuga onwe-gi je ebe ahu; n'ihi na apughm ime ihe rue mb͕e i gābà n'ebe ahu. N'ihi nka ka akpọrọ aha obodo ahu Zoa.

23. Anyanwu awawo n'elu uwa mb͕e Lot batara nime Zoa.

24. Jehova we me ka brimstone na ọku si n'elu-igwe zokwasi Sọdọm na Gọmọra dika miri site n'ebe Jehova nọ;

25. O we kwatue obodo ndia, na Buruburu-ala ahu nile, na ndi nile bi n'obodo ahu nile, na ihe-opupú nke ala.

26. Ma nwunye-ya siri n'azu Lot leghachi anya n'azu, we ghọ ogidi nnú.

27. Abraham we bilie n'isi-ututu je ebe ahu nke o guzorori n'iru Jehova:

28. ọ le anya n'ebe Sọdọm na Gọmọra di, na n'ebe ala nile nke Buruburu-ala ahu di, ọ we hu, ma, le, anwuru-ọku nke ala ahu rigoro dika anwuru-ọku nke oké ọku.

29. O rue, mb͕e Chineke bibiri obodo nile nke Buruburu-ala ahu, na Chineke chetara Abraham, we si n'etiti nkwatu ahu zipu Lot, mb͕e Ọ kwaturu obodo nke Lot biri nime ha.

30. Lot we si na Zoa rigo, biri n'ugwu ahu, ya na umu-ya ndinyom abua; n'ihi na ọ turu egwu ibi nime Zoa: ọ we biri n'ọb͕à, ya onwe-ya na umu-ya ndinyom abua.

31. Ada we si nke-ntà, Nna-ayi aghọwo agadi, ma ọ dighi nwoke n'uwa ibakute ayi, dika uzọ uwa nile si di:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 19