3. si, Onye-nwem, biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, biko, esila n'ebe orù-gi nọ gabiga:
4. biko, ka ekute nwantī miri, unu sa ukwu-unu, zuru-kwa-nu ike n'okpuru osisi a:
5. ka m'weta kwa iberibe achicha, nwe-kwa-nu ume n'obi-unu; emesia gabi-ganu: n'ihi na ọ bu n'ihi nka ka unu gabigakutere orù-unu. Ha we si, Me otú a, dika i kwuru.
6. Abraham we me ngwa ba n'ulo-ikwū-ya, bakuru Sera, si, Me ngwa, weta mb͕é utu ọka flour atọ, gwọ ya, me ob͕e achicha.
7. Abraham we b͕aga n'ìgwè ehi ya, were nwa-ehi nke anu-aru-ya nākaghi aka nke di kwa nma, nye okorọbia nējere ya ozi; o me ngwa idozi ya.
8. O were kwa miri-ara-ehi nke raru araru, na miri-ara-ehi, na nwa-ehi ahu nke o doziri, o che ha n'iru ha; ya onwe-ya we nēguzo n'akuku ha n'okpuru osisi ahu, ha we rie.