Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 18:16-22 Bible Nso (IGBOB)

16. Ndikom ahu we si n'ebe ahu bilie, le anya n'ebe Sọdọm di: Abraham nēso kwa ha je idupu ha.

17. Jehova we si, Mu onwem, M'nēzonari Abraham ihe Mu onwem nēme;

18. ebe Abraham nāghaghi ighọ mba di uku nwe kwa ume, agāgọzi kwa mba nile nke uwa nime ya?

19. N'ihi na amawom ya, ka o we nye umu-ya na ulo-ya, ndi gānọchi ya, iwu, ka ha we debe uzọ Jehova, ime ezi omume na ihe ekpere n'ikpe; ka Jehova we weta n'isi Abraham ihe O kwuru bayere ya.

20. Jehova we si, Iti-nkpu Sọdọm na Gọmọra, o riri nne n'ezie, nmehie-ha kwa, ọ di arọ́ nke-uku n'ezie;

21. ka M'rida kwa, hu ma ọ bu dika iti-nkpu ya si di, nke rurum nti, ka ha mezuworo; ọ buru kwa na ọ dighi otú a, ka M'mara.

22. Ndikom ahu we si n'ebe ahu che iru je n'uzọ Sọdọm: ma Abraham nēguzogide n'iru Jehova.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 18