Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 18:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we me ka ọ hu Ya anya n'etiti osisi terebinth nke Mamre, mb͕e ya onwe-ya nānọdu n'ọnu-uzọ ulo-ikwū-ya n'ikpo-ọku nke ehihie;

2. o welie anya-ya abua elu, hu, ma, le, ndikom atọ nēguzo onwe-ha na ncherita-iru ya: mb͕e ọ huru ha, o si n'ọnu-uzọ ulo-ikwū ahu b͕a ọsọ izute ha, ọ kpọ isi ala,

3. si, Onye-nwem, biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, biko, esila n'ebe orù-gi nọ gabiga:

4. biko, ka ekute nwantī miri, unu sa ukwu-unu, zuru-kwa-nu ike n'okpuru osisi a:

5. ka m'weta kwa iberibe achicha, nwe-kwa-nu ume n'obi-unu; emesia gabi-ganu: n'ihi na ọ bu n'ihi nka ka unu gabigakutere orù-unu. Ha we si, Me otú a, dika i kwuru.

6. Abraham we me ngwa ba n'ulo-ikwū-ya, bakuru Sera, si, Me ngwa, weta mb͕é utu ọka flour atọ, gwọ ya, me ob͕e achicha.

7. Abraham we b͕aga n'ìgwè ehi ya, were nwa-ehi nke anu-aru-ya nākaghi aka nke di kwa nma, nye okorọbia nējere ya ozi; o me ngwa idozi ya.

8. O were kwa miri-ara-ehi nke raru araru, na miri-ara-ehi, na nwa-ehi ahu nke o doziri, o che ha n'iru ha; ya onwe-ya we nēguzo n'akuku ha n'okpuru osisi ahu, ha we rie.

9. Ha si ya, Òle ebe Sera, bú nwunye-gi, nọ? Ọ si, Le, ọ nọ n'ulo-ikwū.

10. Ọ si, Aghaghim ichigharikute gi dika mb͕e a n'arọ ọzọ; le kwa, Sera, bú nwunye-gi, gēnwe nwa-nwoke. Ma Sera nuru n'ọnu-uzọ ulo-ikwū, nke di n'azu ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 18